20 Ubọchi nke Jeroboam buru eze we di orú arọ na abua: o we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, Nedab, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.
21 Ma Rehoboam, bú nwa Solomon, bu eze na juda. Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na asa nime Jerusalem, bú obodo nke Jehova rọputara n'etiti ebo nile nke Israel, itiye aha-Ya n'ebe ahu. Aha nne-ya bu Neama, bú nwayi Amon.
22 Juda we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; ha we were nmehie-ha nile nke ha mehiere kpasue Ya ekworo, kari ihe nile ndi bu nna-ha mere.
23 Ha onwe-ha we wu-kwa-ra onwe-ha ebe di elu, na ogidi, na Asherim, n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula;
24 Ọzọ kwa, ndi edoro nsọ ikwa iko di n'ala: ha mere dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.
25 O rue, n'arọ nke-ise nke eze Rehoboam, na Shaishak, bú eze Ijipt, rigotara imegide Jerusalem:
26 o wepu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze; ọbuná ha nile ka o wepuru: o wepu-kwa-ra ọta ọla-edo nile nke Solomon mere.