23 Ha onwe-ha we wu-kwa-ra onwe-ha ebe di elu, na ogidi, na Asherim, n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula;
24 Ọzọ kwa, ndi edoro nsọ ikwa iko di n'ala: ha mere dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.
25 O rue, n'arọ nke-ise nke eze Rehoboam, na Shaishak, bú eze Ijipt, rigotara imegide Jerusalem:
26 o wepu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze; ọbuná ha nile ka o wepuru: o wepu-kwa-ra ọta ọla-edo nile nke Solomon mere.
27 Eze, bú Rehoboam, we me ọta ọla n'ọnọdu ha, nye ha n'aka ndi-isi ndi-ọb͕a-ọsọ, bú ndi nēche ọnu-uzọ ulo eze, ka ha lekọta ha anya.
28 O rue, mb͕e ọ bula eze nābà n'ulo Jehova, na ndi-ọb͕a-ọsọ nēbu ha, we bughachi ha n'ime-ulo ndi-ọb͕a-ọsọ.
29 Ma okwu Rehoboam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?