28 O rue, mb͕e ọ bula eze nābà n'ulo Jehova, na ndi-ọb͕a-ọsọ nēbu ha, we bughachi ha n'ime-ulo ndi-ọb͕a-ọsọ.
29 Ma okwu Rehoboam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?
30 Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile.
31 Rehoboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: aha nne-ya bu Neama, bú nwayi Amon. Abaijam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya.