1 Ma n'arọ nke-iri-na-asatọ nke eze, bú Jeroboam nwa Nebat, ka Abaijam malitere ibu eze Juda.
2 Arọ atọ ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Meaka nwa-nwayi Abishalom.
3 Ọ nējeghari na nmehie nile nke nna-ya, nke o buru ya uzọ me: obi-ya ezughi kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ya, nọ, dika obi Devid, bú nna-ya.
4 Ma n'ihi Devid ka Jehova, bú Chineke-ya, nyere ya oriọna na Jerusalem, ime ka nwa-ya bilie n'ọnọdu ya, na ime ka Jerusalem guzo:
5 n'ihi na Devid mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, o sighi kwa n'ihe ọ bula O nyere ya n'iwu wezuga onwe-ya ubọchi nile nke ndu-ya, ọ bu nání n'okwu Uraia onye Het.
6 Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile nke ndu-ya.