13 Ọzọ kwa, Meaka, bú nne-ya, o wezuga-kwa-ra ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, o sure ya ọku na miri-iyi Kidron.
14 Ma ewezugaghi ebe di elu: otú ọ di, obi Esa zuru okè n'ebe Jehova nọ ubọchi-ya nile.
15 Ọ chibata n'ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ.
16 Ma agha di n'etiti Esa na Beasha, bú eze Israel, ubọchi-ha nile.
17 Beasha, bú eze Israel, we rigo imegide Juda, wue Rema, ka ọ ghara ikwe Esa, bú eze Juda, ka o nwe onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata.
18 Esa we chiri ọla-ọcha nile na ọla-edo nile nke fọduru n'àkù ulo Jehova, na àkù ulo eze nile, nye ha n'aka ndi-orù-ya: eze, bú Esa, we ziga ha jekuru Ben-hedad, nwa Tab-rimon, nwa Hezion, bú eze Siria, nke bi na Damaskọs, si,
19 Ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti mu na gi, na n'etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom gi onyinye, bú ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n'arum rigo.