26 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ nna-ya, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie.
27 Beasha, bú nwa Ahaija, nke ulo Isaka, we kekọta madu imegide ya; Beasha we tib͕ue ya na Gibeton, nke diri ndi Filistia; n'ihi na Nedab na Israel nile nānọchigide Gibeton n'agha.
28 Beasha we me ka ọ nwua n'arọ nke-atọ nke Esa, bú eze Juda, o we buru eze n'ọnọdu ya.
29 O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, na o tib͕uru ulo Jeroboam nile; o kweghi ka onye ọ bula nke nēku ume fọduru Jeroboam, rue mb͕e o kpochapuru ya; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Ahaija onye Shailo:
30 n'ihi nmehie nile nke Jeroboam nke o mehiere, na nke o ji me ka Israel mehie; nime nkpasu-iwe-ya nke o ji kpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe.
31 Ma okwu Nedab nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
32 Ma agha di n'etiti Esa na Beasha, bú eze Israel, ubọchi-ha nile.