31 Ma okwu Nedab nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
32 Ma agha di n'etiti Esa na Beasha, bú eze Israel, ubọchi-ha nile.
33 N'arọ nke-atọ nke Esa, bú eze Juda, ka Beasha, bú nwa Ahaija, malitere ibu eze Israel nile nime Tiaza, orú arọ na anọ.
34 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie.