20 Ma okwu Zimri nile nke fọduru, na nkekọta nke ọ kekọtara madu imegide eze, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
21 Mb͕e ahu ekewara ndi Israel na nkera abua: otù nkera ndi Israel soro Tibni, bú nwa Ginat, ime ya ka ọ buru eze; nkera ọzọ soro Ọmri.
22 Ndi soro Ọmri we di ike kari ndi soro Tibni, bú nwa Ginat: Tibni we nwua, Ọmri we buru eze.
23 N'arọ nke-orú-na-iri-na-otù nke Esa, bú eze Juda, ka Ọmri malitere ibu eze Israel, arọ iri na abua: ọ bu eze na Tiaza arọ isi.
24 Ọ zuru ugwu Sameria n'aka Shema na talent ọla-ọcha abua; o wue ulo n'ugwu ahu, kpọ aha obodo ahu o wuru Sameria, n'aha Shema, bú onye-nwe ugwu ahu.
25 Ọmri mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, me kwa ihe ọjọ kari ndi nile buru ya uzọ.
26 Ọ je ije n'uzọ nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na nime nmehie-ya nile nke o jiri me ka Israel mehie, iwere ihe-efu nile ha kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe.