28 Akukọ ahu we rue Joab nti: n'ihi na Joab wezugara onwe-ya iso Adonaija n'azu, ọ bu ezie na o wezugaghi onwe-ya iso Absalom n'azu. Joab we b͕alaga n'Ulo-ikwū Jehova, jide mpi ebe-ichu-àjà.
29 Ewe gosi eze, bú Solomon, si, Joab ab͕alagawo n'Ulo-ikwū Jehova, ma, le, ọ nọ n'akuku ebe-ichu-àjà. Solomon we ziga Benaia nwa Jehoiada, si, Je, dakwasi ya.
30 Benaia we biarue Ulo-ikwū Jehova, si ya, Otú a ka eze siri, Puta. Ọ si, É-è; kama n'ebe a ka m'gānwu. Benaia we weghachiri eze okwu, si, Otú a ka Joab kwuru, ọ bu kwa otú a ka ọ zaram.
31 Eze we si ya, Me dika o kwuworo, dakwasi ya, lì kwa ya; ka i we si n'ebe m'nọ na n'ebe ulo nnam nọ wezuga ọbara awusiri n'efu, nke Joab wusiri.
32 Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.
33 Ọbara-ha gālaghachi kwa n'isi Joab, na n'isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova.
34 Benaia nwa Jehoiada we rigo, dakwasi ya, me ka ọ nwua; ewe lìe ya n'ulo-ya n'ọzara.