4 Eze Israel we za, si, Dika okwu-gi si di, Onye-nwem, eze; nke gi ka mu onwem na ihe nile m'nwere bu.
5 Ndi-ozi ahu we biaghachi, si, Otú a ka Ben-hedad kwuru, si, N'ezie eziterem i ozi, si, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi na ndinyom-i na umu-gi, mu ka i gēnye ha;
6 ma m'gēzitere gi ndi-orùm dika mb͕e a echi, ha gāchọ kwa n'ulo-gi, na ulo ndi-orù-gi;ọ gēru kwa, na ihe ọ bula anya-gi nāchọsi ike, ha gētiye ya n'aka-ha, were ya.
7 Eze Israel we kpọ ndi-okenye nile nke ala, si, Biko, maranu, hu kwa, na ọ bu ihe ọjọ ka nwoke a nāchọ: n'ihi na o ziterem ozi ichinye ya ndinyom nkem, na ichinye ya umum, na inye ya ọla-ọcham, na inye ya ọla-edom; ma eb͕ochighm ha n'aka-ya.
8 Ndi-okenye nile na ndi Israel nile we si ya, Anula okwu-ya, ekwe-kwa-la.
9 O we si ndi-ozi Ben-hedad, Sinu onye-nwem, bú eze, Ihe nile i buru uzọ zitere orù-gi ozi ime, nke ahu ka m'gēme: ma ihe a, apughm ime ya. Ndi-ozi we la, weghachiri ya okwu.
10 Ben-hedad we zigara ya ozi, si, Ka chi mem otú a, ka ha mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ájá Sameria gēzu nju-aka inye ndi nile nọ n'ukwum.