45 Ma okwu Jehoshafat nile nke fọduru, na ihe idi-ike-ya nke o mere, na otú o buru agha, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?
46 Ọzọ, ndi fọduru n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko, bú ndi fọduru n'ubọchi Esa nna-ya, o kpochapuru ha n'ala.
47 Ma eze adighi n'Edom: onye edoro onye-isi bu eze.
48 Jehoshafat mere ub͕ọ Tashish ijeru Ofia ibute ọla-edo: ma ha ejeghi; n'ihi na etiwara ub͕ọ ahu n'Ezion-geba.
49 Mb͕e ahu Ehazaia nwa Ehab siri Jehoshafat, Ka ndi-orùm soro ndi-orù-gi je n'ub͕ọ-gi. Ma Jehoshafat ekweghi.
50 Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid nna-ya: Jehoram nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
51 Ehazaia nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n'arọ nke-iri-na-asa nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze Israel arọ abua.