14 Ahinadab nwa Ido, nime Mahanaim:
15 Ahimaaz, nime Naftali; onye ahu lu-kwa-ra Basemat nwa Solomon na nwunye:
16 Beana nwa Hushai, n'Asha na Bealot:
17 Jehoshafat nwa Parua, n'Isaka:
18 Shimai nwa Ila, nime Benjamin:
19 Gebea nwa Uri, n'ala Gilead, bú ala Saihon eze ndi-Amorait na nke Og, bú eze Beshan; ma nání ya bu onye edoro onye-isi nke di n'ala ahu.
20 Juda na Israel di ọtutu, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu.