19 Gebea nwa Uri, n'ala Gilead, bú ala Saihon eze ndi-Amorait na nke Og, bú eze Beshan; ma nání ya bu onye edoro onye-isi nke di n'ala ahu.
20 Juda na Israel di ọtutu, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu.
21 Solomon we nāchi ala-eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya.
22 Ihe-oriri Solomon nke diri otù ubọchi bu kwa orú ọtùtù ọka na iri nke utu ọka flour, na ọgu ọtùtù ọka atọ nke utu ọka;
23 ehi iri mara abuba, na orú ehi site n'ebe anāzù anu, na ọgu aturu ise, nāgughi ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ọkuku emere ka ha ma abuba.
24 N'ihi na ya onwe-ya nwere ike n'aru ndi nile bi n'ofè Osimiri, site na Tifsa we rue Geza, bú n'aru eze nile n'ofè Osimiri: o nwe-kwa-ra udo site n'ofè ọzọ nile di ya buruburu.
25 Juda na Israel we biri na ntukwasi-obi, nwoke ọ bula n'okpuru osisi vine ya na n'okpuru osisi fig ya, site na Dan we rue na Biasheba, ubọchi nile nke Solomon.