2 Ma ndia bu ndi-isi o nwere; Azaraia nwa Zedok bu onye-nchu-àjà;
3 Elihoref na Ahaija, umu-ndikom Shisha, bu ndi-ode-akwukwọ; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta;
4 Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi usu-ndi-agha; Zedok na Abaiata bu ndi-nchu-àjà;
5 Azaraia nwa Netan bu onye-isi nke ndi edoro ndi-isi; Zabud nwa Netan bu onye-isi n'ije ozi na eyì eze;
6 Ahisha bu onye-isi ulo eze; Adonairam nwa Abda bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè.
7 Solomon nwe-kwa-ra ndikom iri na abua edoro ndi-isi Israel nile, ndi nāzù eze na ulo-ya: nwoke ọ bula nime ha nwe izù eze otù ọnwa n'arọ.
8 Ndia bu kwa aha-ha: Ben-hua, n'ugwu Efraim: