1 O rue, n'arọ nke-nnù-na-ọgu-anọ site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt putasia, n'arọ nke-anọ nke Solomon bu eze Israel, n'ọnwa Ziv, nke bu ọnwa nke-abua, na o wubere Jehova ulo.
2 Ma ulo ahu nke eze, bú Solomon, wuru Jehova, ọgu cubit atọ ka ogologo-ya di, orú cubit ka obosara-ya di, orú cubit na iri ka idi-elu-ya di.
3 Uzọ-nbata kwa nke di n'iru ulo uku nke ulo ahu, orú cubit ka ogologo-ya di, n'iru obosara ulo ahu; cubit iri ka obosara-ya di n'iru ulo ahu.
4 O we mere ulo ahu window ufọdu di obosara nime, kpa kwa nkpa n'èzi.
5 O wu-kwa-ra okpukpu-ulo n'akuku mb͕idi ulo ahu buruburu, bú mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu, ma nke ulo uku Chineke ahu, ma nke ime-ime-ulo ahu: o me-kwa-ra ulo ntà nke akuku buruburu:
6 Okpukpu-ulo nke dikarisiri ala, cubit ise ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-etiti kwa, cubit isi ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-atọ kwa, cubit asa ka obosara-ya di: n'ihi na o tiyere ngwe n'ulo ahu buruburu n'èzí, ka ihe we ghara ibà na mb͕idi ulo ahu.
7 Ulo ahu, mb͕e anēwu ya, eji nkume nke awazuru awazu mb͕e ebutere ya wue ya: anughi kwa otùtù ma-ọbu anyu-ike ma-ọbu ihe-ọlu ọ bula nke ígwè n'ulo ahu, mb͕e anēwu ya.