17 Ulo ahu, nke ahu bú, ulo uku Chineke nke di n'iru ya, di ọgu cubit abua n'ogologo.
18 Osisi cedar di kwa n'aru ulo ahu nime, nke apiri ihe otutu, bú afufa-ọhia na okoko-osisi wara awa: ime ulo ahu nile bu osisi cedar; ọ dighi nkume ahuru anya.
19 O dozi-kwa-ra ime-ime-ulo n'etiti ulo ahu nime, itiye ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe ahu.
20 Ma n'iru ime-ime-ulo ahu di orú cubit n'ogologo, na orú cubit n'obosara, na orú cubit n'idi-elu-ya; ọ machita ya ọla-edo makarisiri nma: o were kwa osisi cedar machita ebe-ichu-àjà.
21 Solomon we were ọla-edo makarisiri nma machita ulo ahu nime: o me ka iyab͕a ọla-edo gabiga n'iru ime-ime-ulo ahu; ọ machita kwa ya ọla-edo.
22 Ọ machita-kwa-ra ulo ahu nile ọla-edo, rue mb͕e amachitazuru ulo nile: o were kwa ọla-edo machita ebe-ichu-àjà ahu nile bu nke diri ime-ime-ulo ahu.
23 O me-kwa-ra cherubim abua nke osisi manu olive n'ime-ime-ulo ahu, cubit iri ka elu-ha di.