25 Ọ nēguzo n'elu ehi iri na abua, atọ nēche iru n'Ugwu, atọ nēche iru n'Ọdida-anyanwu, atọ nēche iru na Ndida, atọ nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu: oké osimiri ahu we dikwasi ha n'elu, azu-ha nile di kwa nime.
26 Ib͕idi-ya di otù ntù-ọbu-aka; emere ọnu-ya dika anēme ọnu iko, dika okoko urodi: nnù bath ise ka ọ nānagide.
27 Ọ me ihe-ndọkwasi iri nke ọla; cubit anọ ka ogologo otù ihe-ndọkwasi di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu-ya di kwa.
28 Ma nka bu otú emere ihe-ndọkwasi: ha nwere ihe-njikọ, bú ihe-njikọ n'etiti nkwukọta-ya:
29 ọdum na ehi na cherubim di n'ihe-njikọ nke di n'etiti nkwukọta ahu; ihe-ndọkwasi dikwasi na nkwukọta n'elu: ihe aturu atu nke emere ka o yie ihe-nkwuba di kwa n'okpuru ọdum nile na ehi nile.
30 Ihe-ndọkwasi ọ bula nwere wheel ọla anọ, na axle ọla: ukwu-ya anọ nwere ubu: n'okpuru ite ọsisa-miri ahu ka ubu ahu akpuru akpu di, n'akuku ihe aturu atu ọ bula.
31 Ọnu-ya nime isi-ya na n'elu di otù cubit: ọnu-ya di kwa buruburu, otú emere ihe-ndọkwasi, otù cubit na nkera cubit: ihe-ọpipi dikwasi kwa n'ọnu-ya, ihe-njikọ nile ha nwere akuku anọ ra nrata, ha adighi buruburu.