43 na ihe-ndọkwasi iri ahu, na ite ọsisa-miri iri ahu nke di n'elu ihe-ndọkwasi;
44 na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n'okpuru oké osimiri;
45 na ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile: ma ihe ndia nile, nke Hairam mere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova, bu ọla nēb͕u maramara.
46 Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n'ala urọ n'etiti Sukot na Zaretan.
47 Solomon we dọba ihe ahu nile ghara itù ha, n'ihi na ha bara uba nke ukwu: achọputaghi ọtùtù ọla ahu.
48 Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n'ulo Jehova: ebe-ichu-àjà ọla-edo, na table nke achicha iru Chineke di n'elu ya, ọ bu ọla-edo:
49 na ihe-idọba-oriọna, ise n'aka-nri, ise n'aka-ekpe, n'iru ime-ime-ulo ahu, ha bu ọla-edo makarisiri nma; na okoko-osisi nile, na oriọna nile, na nkpa nile, ha bu ọla-edo;