25 Ub͕ò atọ n'arọ ka Solomon surere àjà-nsure-ọku na àjà-udo nye Jehova n'elu ebe-ichu-àjà nke o wuru, o we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ tiyere ya n'elu ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova. O we wuzue ulo ahu.
26 Eze, bú Solomon, me-kwa-ra ub͕ọ n'Ezion-geba, nke di n'akuku Ilot, n'usọ Oké Osimiri Uhie, n'ala Edom.
27 Hairam we zìe ndi-orù-ya n'ub͕ọ-ya, bú ndi-ub͕ọ ndi mara oké osimiri, ha na ndi-orù Solomon.
28 Ha we biarue Ofia, si n'ebe ahu weta ọla-edo, nnù talent na orú talent, wetara eze, bú Solomon.