7 M'gēbipu kwa Israel n'elu ala nka nke M'nyeworo ha; M'gēsi kwa n'irum tupu ulo a, nke M'doworo nsọ nye aham; Israel gāghọ kwa ilu na ihe-àkùkù n'etiti ndi ọzọ nile:
8 ulo a kwa, nke kachasi elu, o gēju onye ọ bula nke nāgabiga ya anya, ọ gāma ọsọ; ha gāsi kwa, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka na ulo a otú a?
9 Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke-ha, Onye mere ka ndi bu nna-ha si n'ala Ijipt puta, ha we jide chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha, fè ha òfùfè: n'ihi ya ka Jehova meworo ka ihe ọjọ a nile biakwasi ha.
10 O rue, n'ọgwugwu orú arọ, nke Solomon wuru ulo abua nime ha, bú ulo Jehova na ulo eze,
11 (ma Hairam, bú eze Taia, were osisi cedar, were kwa osisi fir, were kwa ọla-edo, yere Solomon aka, dika ihe nile si di nke nātọ ya utọ,) na eze Solomon nyere Hairam orú obodo n'ala Galili mb͕e ahu.
12 Hairam we si na Taia puta ihu orú obodo ahu nke Solomon nyere ya; ma ha ezighi ezi n'anya-ya.
13 O we si, Gini bu obodo ndia nke i nyeworom, nwa-nnem? Ọ we kpọ ha ala Kabul, rue ta.