1 Ma otù nwoke nke Ramataim-zofim, nke ugwu Efraim, di, aha-ya bu Elkena, nwa Jeroham, nwa Elaihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Efrata:
2 o nwekwara ndinyom abua; aha otù bu Hana, aha nke ibe-ya bu Penina: Penina nwere umu, ma Hana enweghi umu.
3 Nwoke a we si n'obodo-ya nārigo kwa-arọ ikpọ isi ala na ichuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha àjà n'ime Shailo. Ọ bu kwa n'ebe ahu ka umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, ndi-nchu-àjà Jehova, nọ.
4 Ubọchi ahu wee rue, Elkena we chua àjà, nye Penina nwunye-ya òkè ufọdu, nye kwa umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom nile:
5 ma o nyere Hana òkè madu abua: n'ihi na ọ bu Hana ka ọ huru n'anya, ma Jehova mechiri àkpà-nwa-ya.