7 Ọ bu kwa otú a ka Elkena nēme kwa-arọ, mb͕e ọ bula Hana rigoro n'ulo Jehova, otú a ka Penina nākpasu ya iwe; o we kwa ákwá, ghara iri ihe.
8 Elkena, bú di-ya, we si ya, Hana, n'ìhi gini ka i nākwa ákwá? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i nērighi ihe? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka obi-gi jọrọ njọ? mù onwem adighi nma n'ebe i nọ kari umu-ndikom iri?
9 Hana we bilie mb͕e ha risiri ihe nime Shailo, mb͕e ha ṅusikwara ihe-ọṅuṅu. Ma Ilai, bú onye-nchu-àjà, nānọkwasi n'oche-ya n'akuku awara-uzọ ulo uku Jehova.
10 O we di Hana ilu na nkpuru-obi, o we kpere Jehova, kwasie ákwá ike.
11 Ọ we kwe nkwa, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ buru na I lekwasi anya n'ezie na nweda-n'ala nke orù-Gi nwayi, ọ buru na I chetam, ghara ichezọ orù-Gi nwayi, we nye orù-Gi nwayi nwa-nwoke, m'gēnye kwa ya Jehova ubọchi ndu-ya nile, aguba agaghi-aga kwa n'elu isi-ya.
12 O rue, mb͕e o kpere ọtutu ekpere n'iru Jehova, na Ilai nāriba ọnu-ya ama.
13 Ma Hana, ya onwe-ya nēkwu okwu n'obi-ya; nání egbugbere-ọnu-ya nēme úkpọ̀rọ́, ma anughi olu-ya: Ilai we chè na ọ ṅubigara manya ókè.