20 Samuel we si ndi Israel, Unu atula egwu: unu onwe-unu emewo ihe ọjọ a nile; nání unu ewezugala onwe-unu n'iso Jehova, kama werenu obi-unu nile fè Jehova òfùfè;
21 unu ewezuga-kwa-la onwe-unu: n'ihi na mb͕e ahu ka unu ganēso n'azu ihe tọb͕ọrọ n'efu, nke nādighi-abà urù, nke nādighi-anaputa kwa, n'ihi na ihe tọb͕ọrọ n'efu ka ha bu.
22 N'ihi na Jehova agaghi-arapu ndi-Ya n'ihi aha uku Ya: n'ihi na Jehova ekwewo ime unu ka unu buru Ya otù ndi.
23 Mu onwem kwa, ya burum ihe-árú, bú ka m'mehie megide Jehova n'igha ikpe ekpere bayere unu: ma m'gēzí unu ihe n'uzọ ahu di nma nke ziri ezi.
24 Nání tuanu egwu Jehova, were obi-unu nile fè Ya òfùfè n'ezi-okwu: n'ihi na, lenu ihe uku O meworo n'ebe unu nọ.
25 Ma ọ buru na unu eme ihe ọjọ nāga n'iru, agēkpochapu unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu.