14 Ma ub͕u a ala-eze-gi agaghi-eguzosi ike: Jehova achọputaworo Onwe-ya otù nwoke dika obi-Ya si chọ, Jehova enyewo kwa ya iwu ibu onye-ndú ndi-Ya, n'ihi na i debeghi ihe ahu nke Jehova nyere gi n'iwu.
15 Samuel we bilie, si na Gilgal rigorue Gibea Benjamin. Sọl we gukota ndi Israel, bú ndi ahutara n'aka-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri.
16 Sọl, na Jonatan nwa-ya, na ndi ahutara n'aka-ha, we nọdu na Geba Benjamin: ma ndi Filistia mara ulo-ikwū-ha na Mikmash.
17 Ndi-nbibi we si n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia puta n'usu atọ: otù usu chere iru n'uzọ Ọfra, rue ala Shual:
18 otù usu we che iru n'uzọ Bet-horon: otù usu we che iru n'uzọ ókè-ala nke nēlekwasi ndagwurugwu Zeboim anya, n'ebe ọzara di.
19 Ma achọtaghi uzú ọ bula n'ala nile nke Israel: n'ihi na ndi Filistia siri, Ka ndi-Hibru we ghara ikpu mma-agha ma-ọbu ube:
20 Israel nile we ridakuru ndi Filistia iti ihe-ọlu-ha ufe, onye ọ bula ígwè-ikpọzè-ala-ya, na mma-ọgè-ya, na anyu-ike-ya, na ọ́gù-ya;