16 Sọl, na Jonatan nwa-ya, na ndi ahutara n'aka-ha, we nọdu na Geba Benjamin: ma ndi Filistia mara ulo-ikwū-ha na Mikmash.
17 Ndi-nbibi we si n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia puta n'usu atọ: otù usu chere iru n'uzọ Ọfra, rue ala Shual:
18 otù usu we che iru n'uzọ Bet-horon: otù usu we che iru n'uzọ ókè-ala nke nēlekwasi ndagwurugwu Zeboim anya, n'ebe ọzara di.
19 Ma achọtaghi uzú ọ bula n'ala nile nke Israel: n'ihi na ndi Filistia siri, Ka ndi-Hibru we ghara ikpu mma-agha ma-ọbu ube:
20 Israel nile we ridakuru ndi Filistia iti ihe-ọlu-ha ufe, onye ọ bula ígwè-ikpọzè-ala-ya, na mma-ọgè-ya, na anyu-ike-ya, na ọ́gù-ya;
21 (ọnu ọ́gù na nke nma-ọgè na nke ndudu-ilu-ọlu-ubi na nke anyu-ike we ghara idi nkọ); na ikpu ọnu ndudu eji achu ehi.
22 O rue, n'ubọchi agha, na ahutaghi mma-agha ma-ọbu ube n'aka onye ọ bula n'etiti ndi soro Sọl na ndi soro Jonatan: ma ahutara n'aka Sọl na n'aka Jonatan nwa-ya.