20 Sọl na ndi nile ya na ha nọ we kpọkọta onwe-ha, ba n'agha ahu: ma, le, mma-agha nwoke ọ bula digidere ibe-ya, oké ọb͕ub͕a-aghara uku we di.
21 Ma ndi-Hibru ndi diri ndi Filistia na mb͕e gara aga, ndi soro ha rigo n'ọmuma-ulo-ikwū buruburu, ndi ahu we chighari kwa idi n'akuku Israel ndi nọ n'aka Sọl na Jonatan.
22 Ndikom nile nke Israel ndi zoro onwe-ha n'ugwu Efraim we nu na ndi Filistia ab͕alagawo, ha onwe-ha we sogidesi kwa ha ike n'agha ahu.
23 Jehova we zọputa Israel n'ubọchi ahu: agha ahu we gabiga rue Bet-even.
24 Ma achiri ndikom Israel n'ihe-ike ubọchi ahu: Sọl we b͕a ndi Israel iyi, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri rue anyasi, ru kwa mb͕e m'bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom. Ndi Israel nile we ghara idetu nri ọnu.
25 Ndi ala ahu nile we ba n'oké ọhia; ma manu-aṅu di n'elu ọhia.
26 Ndi Israel we ba n'oké ọhia ahu, ma, le, manu-aṅu nērù erù: ma ọ dighi onye kwere ka aka-ya rue ọnu-ya; n'ihi na ndi Israel turu egwu ọb͕ub͕a-iyi ahu.