43 Sọl we si Jonatan, Gosim ihe i meworo. Jonatan we gosi ya, si, N'ezie ewerem ọnu-ọnu nkpa-n'aka nke di n'akam detu nwantī manu-aṅu ire; lem, m'gānwu.
44 Sọl we si, Chineke me otú a, me kwa ihe ọzọ otú a: n'ihi na i ghaghi inwu, Jonatan.
45 Ndi Israel we si Sọl, Jonatan, ọ̀ gānwu, bú onye zọputara nzọputa uku a n'Israel? ya buru ihe-árú: Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nke isi-ya gādaru ala; n'ihi na ya na Chineke aluwo ọlu ta. Ndi Israel we b͕aputa Jonatan, o we ghara inwu.
46 Sọl we si n'iso ndi Filistia rigo: ndi Filistia we la n'ebe nke ha.
47 Ma Sọl were ala-eze ahu, buru eze Israel, o we bue agha megide ndi-iro-ya nile buruburu, megide Moab, megide kwa umu Amon, megide kwa Edom, megide kwa ndi-eze Zoba, megide kwa ndi Filistia: ma n'ebe ọ bula ọ nēcheghari iru ọ nālub͕u ha.
48 O we me ihe dìnkpà, tib͕u kwa Amalek, we naputa Israel n'aka ndi nāpunara ha ihe.
49 Ma umu-ndikom Sọl bu Jonatan, na Ishvi, na Malki-shua: aha umu-ya ndinyom abua kwa: aha nke ada-ya bu Mirab, aha nke-ntà bu Maikal: