29 Ọzọ kwa, Ebube Israel agaghi-ekwu okwu-ugha, Ọ gaghi-echeghari kwa: n'ihi na Ọ bughi madu nke Ọ gēji cheghari.
30 O we si, Emehiewom: biko, sọpurum ub͕u a n'iru ndi-okenye ndim, na n'iru Israel; sorokwam laghachi, ka m'we kpọ isi ala nye Jehova, bú Chineke-gi.
31 Samuel we laghachi soro Sọl n'azu; Sọl we kpọ isi ala nye Jehova.
32 Samuel we si, Menu ka Egag eze Amalek biaruem nso. Egag we biakute ya n'iru-utọ. Egag we si, N'ezi-okwu ilu ọnwu ewezugawo onwe-ya.
33 Samuel we si, Dika mma-agha-gi meworo ndinyom ka ha b͕ara aka nwa, otú a ka nne-gi gāb͕ara aka nwa n'etiti ndinyom. Samuel we b͕ukasia Egag n'iru Jehova nime Gilgal.
34 Samuel we la na Rema; Sọl we rigorue ulo-ya, rue Gibea nke Sọl.
35 Samuel abiaghi kwa ọzọ ihu Sọl rue ubọchi ọnwu-ya; n'ihi na Samuel nēruru Sọl újú: ma Jehova cheghariri na o mere Sọl ka ọ buru eze Israel.