17 Sọl we si ndi-orù-ya, Biko, hutaranum nwoke nke nākpọ ubọ nke-ọma, me-kwa-nu ka ọ biakutem.
18 Otù nime umu-okorọbia-ya we za, si, Le, ahuwom otù nwa Jesi, bú onye Bet-lehem, onye mara ikpọ ubọ nke-ọma, ọ bu kwa dike nke bu dìnkpà, buru kwa nwoke agha, o nwe-kwa-ra uche n'okwu, buru kwa nwoke mara nma n'aru, Jehova nọye-kwa-ra ya.
19 Sọl we zigara Jesi ndi-ozi, si, Ziterem Devid nwa-gi, nke nọ n'etiti ìgwè ewu na aturu.
20 Jesi we were otù inyinya-ibu nke eboro ya achicha, na otù karama-akpukpọ manya-vine, na otù nwa-ewu, we zigara Sọl n'aka Devid, bú nwa-ya.
21 Devid we biakute Sọl, guzo n'iru ya: o we hu ya n'anya nke-uku; o we ghọrọ ya onye nēbu ihe-agha.
22 Sọl we zigara Jesi ozi, si, Biko, ka Devid guzo n'irum; n'ihi na ọ hutawo amara n'irum.
23 O rue, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke di n'aru Sọl, na Devid were ubọ-akwara-ya, were aka-ya kpọ ya: aru we dajua Sọl, o we di ya nma, mọ ọjọ ahu we si n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya.