34 Jonatan we si na table bilie n'iwe di ọku, o righi kwa nri n'ubọchi nke-abua nke ọnwa ahu: n'ihi na o wutara ya n'ihi Devid, n'ihi na nna-ya mere ya ihe-ihere.
35 O rue, n'ututu, na Jonatan puru je n'ọhia na mb͕e ya na Devid kara àkà, otù nwatakiri-nwoke so kwa ya.
36 Ọ si nwa-okoro-ya, B͕a ọsọ, biko chọta àkú nile nke mu onwem nāb͕a. Mb͕e nwa-okoro ahu nāb͕a ọsọ, ya onwe-ya we b͕a àkú, me ka ọ gabiga ya.
37 Nwa-okoro ahu we biarue ebe àkú ahu di, bú nke Jonatan b͕ara, Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Àkú ahu, ọ̀ dighi n'akuku iru gi?
38 Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Me ngwa, je ọsọsọ, eguzola. Nwa-okoro Jonatan we chikọta àkú, biakute onye-nwe-ya.
39 Ma nwa-okoro ahu amaghi ihe ọ bula: nání Jonatan na Devid mara okwu ahu.
40 Jonatan we nye nwa-okoro o nwere ihe-ya, si ya, La, chiri ha ba n'obodo.