4 Jonatan we si Devid, Gini ka nkpuru-obi-gi nāsi? m'gēme-kwa-ra gi ya.
5 Devid we si Jonatan, Le, ọnwa ọhu gāpu echi, mu onwem aghaghi kwa iso eze nọdu n'iri ihe: ma zilagam, ka m'we zo onwem n'ọhia rue anyasi nwa-nne-echi.
6 Ọ buru na nna-gi ele anyam ma-ọli, i gāsi kwa, Devid riọsirim ike ka m'rapu ya ka ọ b͕a ọsọ je Bet-lehem, bú obodo-ya: n'ihi na àjà arọ diri ab͕uru-ya nile n'ebe ahu.
7 Ọ buru na ọ si otú a, Ọ di nma; udo gādiri orù-gi: ma ọ buru na iwe-ya di ọku nke-uku, mara na o zubesiri ihe ọjọ a ike.
8 Ma i gēmere orù-gi ebere; n'ihi na i mere ka orù-gi soro gi ba n'ọb͕ub͕a-ndu Jehova: ma ọ buru na ajọ omume di nimem, gi onwe-gi me ka m'nwua; ma n'ìhi gini kwa ka i gēme ka m'bakuru nna-gi?
9 Jonatan we si, Ya buru gi ihe-árú: n'ihi na ọ buru na amaram n'ezie na nnam zubesiri ike ka ihe ọjọ a biakwasi gi, #m'gaghi-egosi kwa gi ya?
10 Devid we si Jonatan, Ònye gēgosim? ma-ọbu gini gēme ma ọ buru na nna-gi aza gi okwu ike?