8 Ma i gēmere orù-gi ebere; n'ihi na i mere ka orù-gi soro gi ba n'ọb͕ub͕a-ndu Jehova: ma ọ buru na ajọ omume di nimem, gi onwe-gi me ka m'nwua; ma n'ìhi gini kwa ka i gēme ka m'bakuru nna-gi?
9 Jonatan we si, Ya buru gi ihe-árú: n'ihi na ọ buru na amaram n'ezie na nnam zubesiri ike ka ihe ọjọ a biakwasi gi, #m'gaghi-egosi kwa gi ya?
10 Devid we si Jonatan, Ònye gēgosim? ma-ọbu gini gēme ma ọ buru na nna-gi aza gi okwu ike?
11 Jonatan we si Devid, Bia, ka ayi pua je n'ọhia. Ha abua we pua je n'ọhia.
12 Jonatan we si Devid, Jehova, bú Chineke Israel, Ya buru onye-àmà; mb͕e m'gēnyochata obi nnam dika mb͕e a echi, ma-ọbu nwa-nne-echi, ma, le, ọ di nma n'ebe Devid nọ, #m'gaghi-ezite-kwa-ra gi ozi, we kpughepu nti-gi ka i nu ya?
13 Jehova me Jonatan otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, mb͕e ọ di nnam nma ime gi ihe ọjọ a, ma m'kpughepughi nti-gi ka i nu ya, we zilaga gi, ka i we la n'udo: Jehova nọye-kwa-ra gi, dika Ọ nọyeworo nnam.
14 Ma ọ bughi nání mb͕e m'nọ na ndu ka i gēmerem ebere nke Jehova, ka m'we ghara inwu: