1 Ha we gosi Devid, si, Le, ndi Filistia nēbuso Keila agha, ndi ahu nāpunara ha ebe-nzọcha-ọka nile ha.
2 Devid we jua Jehova ase, si, M'gēje tib͕ue ndi Filistia ndia? Jehova we si Devid, Je, tib͕ue ndi Filistia, zọputa Keila.
3 Ndikom Devid we si ya, Le, ayi onwe-ayi nātu egwu n'ebe a nime Juda: àyi gēsi kwa aṅa ghara itu egwu kari mb͕e ayi gēje Keila, rue usoro-agha nile nke ndi Filistia?
4 Devid we ju kwa Jehova ase ọzọ. Jehova we za ya, si, Bilie, rida rue Keila; n'ihi na Mu onwem nēnye ndi Filistia n'aka-gi,