10 Devid we si, Jehova nādi ndu, Jehova aghaghi itib͕u ya; ma-ọbu ubọchi-ya gābiaru, o we nwua; ma-ọbu na ọ gārida n'agha, ewe kpochapu ya.
11 Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú iseti akam megide onye Jehova etere manu: ma ub͕u a, biko, were ube di n'akuku isi-ya, na ite miri, ka ayi la.
12 Devid we were ube na ite miri site n'akuku isi Sọl; ha we la, ma ọ dighi onye nāhu ha, ọ dighi kwa onye mara, ọ dighi kwa onye nēteta: n'ihi na ha nile nāraru ura; n'ihi na oké ura nke Jehova dakwasiri ha.
13 Devid we gabiga n'ofè ọzọ, guzo n'elu ugwu n'ebe di anya; ebe-mbara n'etiti ha riri nne:
14 Devid we kpọ ndi Israel òkù, kpọ kwa Abnea nwa Nea, si, Ì zaghi, Abnea? Abnea we za, si, Ònye ka i bu nke nākpọ eze òkù?
15 Devid we si Abnea, Ọ̀ bughi nwoke ka i bu? ònye di kwa ka gi n'Israel? n'ìhi gini kwa ka i nēdebeghi onye-nwe-gi, bú eze, nke-ọma? n'ihi na otù onye nime ndi Israel batara ibibi eze, bú onye-nwe-gi.
16 Ọ dighi nma, bú ihe a nke i meworo. Jehova nādi ndu, ndi kwesiri ọnwu ka unu bu, n'ihi na unu edebeghi onye-nwe-unu nke-ọma, bú onye Jehova etere manu. Ma ub͕u a, le ebe ube eze di, na ite miri nke di n'akuku isi-ya.