20 Ma ub͕u a, ka ọbaram ghara ida n'ala pua n'iru Jehova: n'ihi na eze Israel aputawo ichọ otù igwu, dika mb͕e madu nāchu ntá ọkwa n'ugwu.
21 Sọl we si, Emehiewom: lata, nwam Devid: n'ihi na m'gaghi-emejọ gi ọzọ, n'ihi na ndum di oké ọnu-ahia n'anya-gi ta: le, emewom ihe-nzuzu, me kwa ihe nke-uku ri nne n'amaghi-ama.
22 Devid we za, si, Le, ube-gi, eze! ka otù onye nime umu-okorọbia feta kwa, were ya.
23 Jehova gēnyeghachi kwa nwoke ọ bula ezi omume-ya na ikwesi-ntukwasi-obi-ya: ebe Jehova nyeworo gi n'akam ta, ma ekweghm iseti akam imegide onye Jehova etere manu.
24 Ma, le, dika ndu-gi di uku ta n'anyam, ka ndum di uku otú a n'anya Jehova, ka Ọ naputakwam na nkpab͕u nile.
25 Sọl we si Devid, Onye agọziri agọzi ka i bu, nwam Devid: i gēme kwa ihe nke-uku, nwe kwa ike nke-uku. Devid we je n'uzọ-ya, ma Sọl laghachiri n'ebe-ya.