8 Abishai we si Devid, Chineke emechibidowo onye-iro-gi nye n'aka-gi ta: ma ub͕u a, biko, ka m'were ube tugide ya n'ala otù ub͕ò, m'gaghi-atu kwa ya nke ub͕ò abua.
9 Devid we si Abishai, Ebibila ya: n'ihi na ònye ka ikpe nāmaghi n'iseti aka-ya megide onye Jehova etere manu?
10 Devid we si, Jehova nādi ndu, Jehova aghaghi itib͕u ya; ma-ọbu ubọchi-ya gābiaru, o we nwua; ma-ọbu na ọ gārida n'agha, ewe kpochapu ya.
11 Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú iseti akam megide onye Jehova etere manu: ma ub͕u a, biko, were ube di n'akuku isi-ya, na ite miri, ka ayi la.
12 Devid we were ube na ite miri site n'akuku isi Sọl; ha we la, ma ọ dighi onye nāhu ha, ọ dighi kwa onye mara, ọ dighi kwa onye nēteta: n'ihi na ha nile nāraru ura; n'ihi na oké ura nke Jehova dakwasiri ha.
13 Devid we gabiga n'ofè ọzọ, guzo n'elu ugwu n'ebe di anya; ebe-mbara n'etiti ha riri nne:
14 Devid we kpọ ndi Israel òkù, kpọ kwa Abnea nwa Nea, si, Ì zaghi, Abnea? Abnea we za, si, Ònye ka i bu nke nākpọ eze òkù?