1 O rue, na mb͕e ahu, na ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha ibu agha, ibuso Israel agha. Ekish we si Devid, Mara nke-ọma na mu ka i gēso pua ba n'ọmuma-ulo-ikwū, gi onwe-gi na ndikom-i.
2 Devid we si Ekish, N'ihi ya gi onwe-gi gāmara ihe orù-gi gēme. Ekish we si Devid, N'ihi ya onye nēdebe isim ka m'gēdo gi ubọchi nile.
3 Ma Samuel anwuruwo, Israel nile we tiere ya aka n'obi, lì kwa ya na Rema, bú n'obodo-ya. Sọl ewezugawo kwa n'ala ndi nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa.
4 Ndi Filistia we chikọta onwe-ha, bia, ma ulo-ikwū-ha na Shunem: Sọl we chikọta Israel nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Gilboa.
5 Sọl we hu ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, o we tua egwu, obi-ya we ma jijiji nke-uku.
6 Sọl we jua Jehova ase, ma Jehova azaghi ya, Ọ zaghi na nrọ, ma-ọbu n'Ìhè, ma-ọbu n'ọnu ndi-amuma.