19 Ọzọ kwa, Jehova gēnye Israel n'aka ndi Filistia tiyere gi: echi ka gi na umu-gi ndikom gānọye-kwa-ram: Jehova gēnye kwa ọmuma-ulo-ikwū Israel n'aka ndi Filistia.
20 Sọl we da n'ala ngwa ngwa ka idi-elu-ya ra, o we tua egwu nke-uku, n'ihi okwu nile nke Samuel: ike adighi kwa nime ya; n'ihi na o righi nri n'ehihie ahu nile, na n'abali ahu nile.
21 Nwayi ahu we biakute Sọl, hu na aru mara ya jijiji nke-uku, ọ si ya, Le, nwanyi nējere gi ozi egewo nti olu-gi, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, nu kwa okwu-gi nile nke i gwaram.
22 Ma ub͕u a, biko, gi onwe-gi ge kwa nti olu nwayi nējere gi ozi, ka m'dọba kwa iberibe achicha n'iru gi; gi ri kwa, ka ike we di nime gi, mb͕e i nēje n'uzọ-gi.
23 Ma ọ juru aju, si, M'gaghi-eri ihe. Ndi-orù-ya, na nwayi ahu kwa, we rugide ya; o we ge nti olu-ha. O we si n'ala bilie, nọkwasi n'ihe-ndina.
24 Ma nwayi ahu nwere n'ulo-ya nwa-ehi emere ka ọ ma abuba; o we me ngwa, b͕ue ya, were kwa utu ọka, gwọ ya, were ya sie achicha ekoghi-eko:
25 o we bute ya nso n'iru Sọl, na n'iru ndi-orù-ya; ha we rie. Ha we bilie, la n'abali ahu.