18 Devid we naputa ihe nile Amalek chiri: Devid naputa-kwa-ra ndinyom-ya abua.
19 Ọ dighi kwa ihe fọduru ha iweghachi, ma ihe ntà ma ihe uku, ma umu-ndikom ma umu-ndinyom, ma ihe-nkwata ma ihe ọ bula ha were n'onwe-ha: Devid weghachiri ihe nile.
20 Devid we chiri ìgwè ewu na aturu nile na ìgwè ehi; ha dupuru ha n'iru anu-ulo ndia, si, Nka bu ihe-nkwata Devid.
21 Devid we biakute ọgu ndikom iri ahu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi ijeso Devid n'azu, ndi ha me-kwa-ra ka ha nọdu n'akuku miri-iyi Besoa: ha we puta izute Devid, na izute ndi ya na ha nọ: Devid we biarue nso ndi ahu, jua ha ajuju bayere udo-ha.
22 Ndikom ọjọ nile na ndi jọb͕uru onwe-ha, n'etiti ndi soro Devid je, we za, si, N'ihi na ha esoghi ayi je, ayi agaghi-enye kwa ha ihe ọ bula nime ihe-nkwata nke ayi naputara, ma-ọbughi inye nwoke ọ bula nwunye-ya na umu-ya, ka ha we duru ha, la.
23 Devid we si, Umu-nnem, ihe Jehova nyere ayi, bú Onye debere ayi, nye kwa n'aka-ayi usu ahu ndi nāpunara madu ihe, ndi biara imegide ayi, unu agaghi-ewere ihe ahu me otú a.
24 Ònye gēge kwa unu nti n'okwu a? n'ihi na dika òkè nke onye nārida n'agha si di, otú a ka òkè nke onye nānọdu n'akuku ihe-ayi di: ha gēkekọ n'otù.