8 Ahuhu nādiri ayi! ònye gānaputa ayi n'aka chi ndia di ike nke-ukwu? ndia bu chi nke were ihe-otiti nile ọ bula tib͕ue ndi Ijipt n'ọzara.
9 Menu onwe-unu ka unu di ike, buru-kwa-nu ndikom, unu ndi Filistia, ka unu ghara iburu ndi-Hibru ndi-orù, dika ha buruworo unu ndi-orù: burunu ndikom, bu-kwa-nu agha.
10 Ndi Filistia we bu agha, ewe tib͕ue Israel, ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya: oké ntib͕u uku we di; orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise, bú ndi ji ukwu eje, we dapu n'Israel.
11 Ewe were ib͕e Chineke; umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nwukwara.
12 Otù nwoke onye Benjamin we si n'usoro agha ahu b͕a ọsọ, biarue Shailo n'ubọchi ahu, uwe nwuda ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi ya n'isi.
13 Ọ we bia, ma, le, Ilai nānọkwasi n'oche-ya n'akuku uzọ, nēche nche: n'ihi na obi-ya nāma jijiji n'ihi ib͕e Chineke. Nwoke ahu we ba igosi ya n'obodo, obodo ahu nile we tie nkpu.
14 Ilai we nu olu iti-nkpu ahu, si, Gini bu olu ùzù a? Nwoke ahu we me ngwa bata, gosi Ilai.