1 Ma otù nwoke Benjamin di, aha-ya bu Kish, nwa Abiel, nwa Zeroa, nwa Bekorat, nwa Afia, nwa onye Benjamin, bú dike nke bu dìnkpà.
2 Ọ nwe-kwa-ra nwa-nwoke, aha-ya bu Sọl, ọ bu nwa-okorọbia, ọ ma-kwa-ra nma: ọ dighi kwa nwoke n'etiti umu Israel mara nma kari ya: site n'ubu-ya we rue elu isi-ya ka ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel.
3 Ma nne-inyinya-ibu nile nke Kish, bú nna Sọl, nwere furu efu. Kish we si Sọl nwa-ya, Biko, kuru otù nime ndi-orù tiyere onwe-gi, bilie, je, chọ nne-inyinya-ibum.
4 O we gabiga n'ugwu Efraim, gabiga kwa n'ala Shalisha, ma ha achọtaghi ha: ha we gabiga n'ala Shaalim, ma ha adighi n'ebe ahu: o we gabiga n'ala Benjamin, ma ha achọtaghi ha.