14 n'ihi na ọ bu ndi nēje ozi ahu ka ha nyere ya, were kwa ya me ka ulo Jehova di ike.
15 Ha na ndikom ahu, ndi ha nēnye ego n'aka-ha inye ndi n'eje ozi ahu, agughi ego ahu: n'ihi na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obí ka ndi ahu nēme ihe.
16 Adighi-ewebata ego àjà-ikpe-ọmuma na ego àjà-nmehie n'ulo Jehova: ọ bu ndi-nchu-àjà nwe ya.
17 Mb͕e ahu Hazael, bú eze Siria, rigoro, buso Gat agha, were ya: Hazael we che iru-ya imegide Jerusalem.
18 Jehoash, bú eze Juda, we chiri ihe nsọ nile nke Jehoshafat, na Jehoram, na Ehazaia, nna-ya-hà, bú ndi-eze Juda, doro nsọ, na ihe nsọ ya nile, na ọla-edo nile anāchọta n'àkù nile nke ulo Jehova, na nke ulo eze, zigara Hazael, bú eze Siria: o we si na Jerusalem rigo.
19 Ma okwu Joash nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?
20 Ndi-orù-ya we bilie, kekọta nkekọta-madu imegide ya, tib͕ue Joash n'ulo Milo, n'uzọ nke nāridaru Sila.