1 N'arọ nke-abua nke Joash nwa Joahaz, bú eze Israel, ka Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, malitere ibu eze.
2 Ọ b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete na Jerusalem: aha nne-ya bu Jehoadin nke Jerusalem.
3 O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, nání na o meghi dika Devid nna-ya; dika ihe nile si di nke Joash nna-ya mere, otú a ka o mere.
4 Nání na ewzugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu.