3 O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, nání na o meghi dika Devid nna-ya; dika ihe nile si di nke Joash nna-ya mere, otú a ka o mere.
4 Nání na ewzugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu.
5 O rue, mb͕e ala-eze di ike n'aka-ya, na o tib͕uru ndi-orù-ya ndi tib͕uru eze, bú nna-ya:
6 ma o meghi ka umu nke ndi-otib͕u-madu ahu nwua: dika nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses si di, nke Jehova nyere n'iwu, si, Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n'ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n'ọnọdu ndi bu nna-ha; kama onye ọ bula gānwu nime nmehie nke aka ya.
7 Ya onwe-ya tib͕uru Edom nime Ndagwurugwu Nnú, orú nnù ndikom na nnù ise, were kwa Sela n'agha, kpọ aha-ya Jokteel, rue ta.
8 Mb͕e ahu Amazaia zigara ndi-ozi jekuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jihu, bú eze Israel, si, Bia, ka ayi lerita onwe-ayi anya n'iru.
9 Jehoash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu.