1 O rue, n'arọ nke-atọ nke Hoshea nwa Ila, bú eze Israel, na Hezekaia nwa Ehaz, bú eze Juda, malitere ibu eze.
2 Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Abi nwa-nwayi Zekaraia.
3 O me ihe ezi ziri n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere.
4 Ya onwe-ya wezugara ebe nile di elu, titue ogidi nile, b͕utue Ashera: o tipia-kwa-ra agwọ ọla nke Moses mere; n'ihi na rue mb͕e ahu umu Israel nēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpọ ya Nehushtan.