10 Ha we were ya n'ọgwugwu arọ atọ: ọ bu n'arọ nke-isi nke Hezekaia, nke ahu bu arọ nke-iteghete nke Hoshea, bú eze Israel, ka ewere Sameria.
11 Eze Asiria we me ka Israel je biri n'Asiria, o we me ka ha nọdu nime Hala na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia:
12 n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, we gabiga ọb͕ub͕a-ndu-Ya, bú ihe nile nke Moses, bú orù Jehova, nyere n'iwu, ha anughi kwa ya, ha emeghi kwa ya.
13 Ma n'arọ nke-iri-na-anọ nke eze, bú Hezekaia, Senakerib, bú eze Asiria, rigoro imegide obodo nile ewusiri ike nke Juda, were ha.
14 Hezekaia, bú eze Juda, we zigara eze Asiria ozi rue Lekish, si, Emehiewom; si n'ebe m'nọ laghachi: ihe i gēbom m'gēburu ya. Eze Asiria we tukwasi Hezekaia, bú eze Juda, ọgu talent ọla-ọcha iri-na-ise na orú talent ọla-edo na iri.
15 Hezekaia we nye ya ọla-ọcha nile nke anāchọta n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze.
16 Na mb͕e ahu ka Hezekaia bipuru ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Jehova, na ogidi nile nke Hezekaia, bú eze Juda, jiri ọla-edo machita, o were ha nye eze Asiria.