24 Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n'aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya?
25 Ub͕u a ọ̀ bu n'ejighi Jehova ka m'rigoro imegide ebe a ibibi ya?
26 Jehovah sirim, Rigo imegide ala nka, bilie ya. Elaiakim nwa Hilkaia, na Shebna, na Joa, we si Rabshake, Biko, gwa ndi orù-gi okwu n'asusu Siria; n'ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: akpaye-kwa-la ayi uka n'asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n'elu mb͕idi.
27 Rabshake we si ha, Ọ̀ bu n'ihi onye-nwe-gi na ijekuru gi ka onye-nwem ziterem ikwu okwu ndia? ọ̀ bughi n'ihi ndikom ahu ndi nānọdu n'elu mb͕idi, ka ha we soro unu rie ǹsí-ha ṅu kwa nwa-miri-ha?
28 Rabshake we guzo, were oké olu kpọ n'asusu ndi-Ju, kwue, si, Nurunu okwu eze uku ahu, bú eze Asiria.
29 Otú a ka eze siri, Unu ekwela ka Hezekaia rafue unu; n'ihi na ọ pughi inaputa unu n'aka-ya:
30 unu ekwe-kwa-la ka Hezekaia me ka unu tukwasi Jehova obi, si, Jehova aghaghi inaputa ayi, agaghi-enye kwa obodo a n'aka eze Asiria.