32 rue mb͕e m'biara chiri unu je n'ala dika ala-unu, bú ala ọka na manya-vine ọhu, ala achicha na ubi-vine, ala manu olive na manu-aṅu, ka unu we di ndu, ghara inwu: unu ege-kwa-la Hezekaia nti, mb͕e ọ nārafu unu, si, Jehova gānaputa ayi.
33 Chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo, onye ọ bula ala-ya, n'aka eze Asiria ma-ọli?
34 Òle ebe chi nile nke Hemat na Apad di? òle ebe chi nile nke Sefavaim na Hina na Iva di? hà anaputawo Sameria n'akam?
35 Òle ndi n'etiti chi nile nke ala dum ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n'akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n'akam?
36 Ma ndi-Ju b͕ara nkiti, ha azaghi kwa ya okwu: n'ihi na ihe eze nyere n'iwu bu nka, si, Unu azala ya.
37 Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.