6 O we rapara Jehova n'aru, o sighi n'iso Ya wezuga onwe-ya, o we debe ihe nile O nyere n'iwu, bú nke Jehova nyere Moses n'iwu.
7 Jehova nọye-kwa-ra ya; n'ebe o bula ọ nāpu o nwere uche: o we nupu isi n'okpuru eze Asiria, o fèghi kwa ya òfùfè.
8 Ya onwe-ya tib͕uru ndi Filistia rue Geza na ókè-ala-ya nile, site n'ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike.
9 O rue, n'arọ nke-anọ nke eze, bú Hezekaia, nke ahu bu arọ nke-asa nke Hoshea nwa Ila, bú eze Israel, na Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide Sameria, nọchigide ya n'agha.
10 Ha we were ya n'ọgwugwu arọ atọ: ọ bu n'arọ nke-isi nke Hezekaia, nke ahu bu arọ nke-iteghete nke Hoshea, bú eze Israel, ka ewere Sameria.
11 Eze Asiria we me ka Israel je biri n'Asiria, o we me ka ha nọdu nime Hala na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia:
12 n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, we gabiga ọb͕ub͕a-ndu-Ya, bú ihe nile nke Moses, bú orù Jehova, nyere n'iwu, ha anughi kwa ya, ha emeghi kwa ya.