1 Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na gi onwe-gi nānwu anwu, i gaghi-adi kwa ndu.
2 O we chigharia iru-ya che mb͕idi iru, kpere Jehova, si,
3 Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.
4 O rue, mb͕e Aisaia akāpughi ba n'etiti obodo, na okwu Jehova ruru ya nti, si,